Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 8:27-30 Bible Nso (IGBOB)

27. Ma mb͕e O siri n'ub͕ọ puta rigo n'ala, otù nwoke nke si n'obodo ahu puta zutere ya, bú onye nwere ndi-mọ ọjọ; ma na mb͕e di anya ọ dighi uwe o yiri, o bighi kwa n'ulo, kama n'ebe anēlì ozu.

28. Ma mb͕e ọ huru Jisus, o tisie nkpu ike, da kwa n'ala n'iru Ya, were oké olu si, Gini ka mu na Gi nwekọrọ, Jisus, Ọkpara Chineke Nke kachasi ihe nile elu? ariọm Gi, emekpalam aru.

29. N'ihi na O nyere mọ ahu nādighi ọcha iwu ka o si nime nwoke ahu puta. N'ihi na ọtutu mb͕e ka ọ nējisi ya ike: anēche kwa ya nche, ewere kwa nkpọrọ na nkpọrọ-ukwu ke ya; o we nyajipu ihe eji ke ya, mọ ọjọ ahu we churu ya ba n'ọhia.

30. Jisus we jua ya, si, Òle aha-gi? Ọ si, Legion; n'ihi na ọtutu ndi-mọ ọjọ bàra nime ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 8