42. Ebe ha nēnweghi ihe ha gēji kwughachi ya ugwọ, ọ were amara b͕aghara ha abua. Ònye kwa n'etiti ha abua gāhu kari ya n'anya?
43. Saimon we za, si, Ọ dim ka onye o were amara b͕aghara kari. O we si ya, I kpeziri.
44. Mb͕e O chigharisiri n'ebe nwanyi ahu nọ, Ọ si Saimon, Ì huru nwanyi a? Abataram n'ulo-gi, i nyeghi m miri iji sa ukwu: ma nwanyi a were anya-miri-ya desa ukwum, were kwa agiri-isi-ya hicha ha.
45. I sutughm ọnu: ma nwanyi a, site na mb͕e M'batara, ọ rapughi isutu ukwum ọnu nke-uku.
46. I weghi manu tem n'isi: ma nwanyi a were manu-otite tem n'ukwu.
47. N'ihi nka asim i, Ab͕agharaworo ya nmehie-ya, nke di ọtutu; n'ihi na ọ hurum n'anya nke-uku: ma onye ab͕aghara ihe ntà, onye ahu nāhu n'anya nke-ntà.
48. O we si nwayi ahu, Ab͕agharaworo gi nmehie nile gi.
49. Ndi ha na Ya nọduru na nri we malite isirita onwe-ha, Ònye bu Onye a, Nke nāb͕aghara kwa nmehie?
50. O we si nwanyi ahu, Okwukwe-gi azọputawo gi; la n'udo.