Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 7:41-46 Bible Nso (IGBOB)

41. Otù onye nke nēbinye madu ihe nwere madu abua ji ya ugwọ: otù onye ji ya nnù shilling na ọgu ise, ibe-ya ji kwa ya ọgu abua na iri.

42. Ebe ha nēnweghi ihe ha gēji kwughachi ya ugwọ, ọ were amara b͕aghara ha abua. Ònye kwa n'etiti ha abua gāhu kari ya n'anya?

43. Saimon we za, si, Ọ dim ka onye o were amara b͕aghara kari. O we si ya, I kpeziri.

44. Mb͕e O chigharisiri n'ebe nwanyi ahu nọ, Ọ si Saimon, Ì huru nwanyi a? Abataram n'ulo-gi, i nyeghi m miri iji sa ukwu: ma nwanyi a were anya-miri-ya desa ukwum, were kwa agiri-isi-ya hicha ha.

45. I sutughm ọnu: ma nwanyi a, site na mb͕e M'batara, ọ rapughi isutu ukwum ọnu nke-uku.

46. I weghi manu tem n'isi: ma nwanyi a were manu-otite tem n'ukwu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 7