Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 7:32-44 Bible Nso (IGBOB)

32. Ha yiri umu-ntakiri ndi nānọdu n'ọma-ahia, nākpọ kwa ibe-ha òkù; ndi nāsi, Ayi b͕uru unu ọ̀jà, ma unu eteghi egwú; ayi kwara ákwá, ma unu etighi mkpu ákwá.

33. N'ihi na Jọn Baptist abiawo nērighi achicha nāṅughi kwa manya-vine; unu we si, O nwere mọ ọjọ.

34. Nwa nke madu abiawo nēri ihe-oriri nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu; unu we si, Le, onye-ori-nke-uku, na onye-oké-ọṅu-manya, enyì ndi-ọna-utu na ndi-nmehie!

35. Agukwara amam-ihe n'onye ezi omume site n'umu-ya nile.

36. Otù onye n'etiti ndi-Farisi we kpere Ya ka O so ya rie ihe. O we ba n'ulo onye-Farisi ahu, we nọdu na nri.

37. Ma le, otù nwanyi nke nọ n'obodo ahu, bú onye-nmehie; mb͕e ọ mara nke-ọma na Ọ nọduru na nri n'ulo onye-Farisi ahu, o we weta ite alabaster nke manu-otite di ya nime,

38. we guzo n'azu n'ukwu-Ya, nākwa ákwá, we malite iwere anya-miri-ya desa ukwu-Ya abua, o were kwa agiri-isi-ya hicha ha, o we sutu ukwu-Ya ọnu nke-uku, were manu-otite ahu te ha.

39. Ma mb͕e onye-Farisi nke kpọrọ Ya huru ya, o kwue n'onwe-ya, si, Nwoke a, asi na Ọ bu onye amuma, Ọ gāmara onye nwanyi a bu nke nēmetu Ya aka, na aha madu ọ bu, na ọ bu onye-nmehie.

40. Jisus we za, si Ya, Saimon, enwerem okwu M'gāgwa gi. O we si, Onye-ozizí, kwue.

41. Otù onye nke nēbinye madu ihe nwere madu abua ji ya ugwọ: otù onye ji ya nnù shilling na ọgu ise, ibe-ya ji kwa ya ọgu abua na iri.

42. Ebe ha nēnweghi ihe ha gēji kwughachi ya ugwọ, ọ were amara b͕aghara ha abua. Ònye kwa n'etiti ha abua gāhu kari ya n'anya?

43. Saimon we za, si, Ọ dim ka onye o were amara b͕aghara kari. O we si ya, I kpeziri.

44. Mb͕e O chigharisiri n'ebe nwanyi ahu nọ, Ọ si Saimon, Ì huru nwanyi a? Abataram n'ulo-gi, i nyeghi m miri iji sa ukwu: ma nwanyi a were anya-miri-ya desa ukwum, were kwa agiri-isi-ya hicha ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 7