Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 7:18-25 Bible Nso (IGBOB)

18. Ndi nēso uzọ Jọn we kọrọ ya akukọ bayere ihe ndia nile.

19. Jọn we kpọ madu abua biakute ya nime ndi nēso uzọ-ya, zigara Onye-nwe-ayi, si, Gì onwe-gi bu Onye nābia, ma-ọbu na ayi nēle anya onye ọzọ?

20. Ma mb͕e ndikom ahu biakutere Ya, ha si, Jọn Baptist ezìwo ayi biakute Gi, si, Gì onwe-gi bu Onye nābia, ma-ọbu na ayi nēle anya onye ọzọ?

21. N'oge hour ahu O mere ka aru ọtutu madu di ike site n'ọria na ajọ ọria di iche iche na ndi ajọ mọ; O were kwa amara me ka ọtutu ndi-ìsì hu uzọ.

22. O we za, si ha, Ganu, kọrọ Jọn ihe nile unu huru na nke unu nuru; ndi-ìsì nāhu uzọ, ndi- ngwurọ nēje ije, anēme ndi-ekpenta ka ha di ọcha, ndi nti chiri nānu ihe, anēme ndi nwuru anwu ka ha si n'ọnwu bilie, anēzì ndi-ob͕eye ozi ọma.

23. Ngọzi nādikwara onye ahu, bú onye ọ bula nke nāgaghi-ama n'ọnyà n'arum.

24. Ma mb͕e ndi-ozi Jọn lasiri, Ọ malitere igwa ìgwè madu nile okwu bayere Jọn, si, Ọ̀ bu gini ka unu puru je n'ọhia ka unu kiri? àmì nke nēme nkpatu site n'ifufe?

25. Ma ọ̀ bu gini ka unu puru ka unu hu? nwòke eyikwasiworo uwe di biali-biali? Le, ndi nēyi ezi uwe kachasi mma, ndi bi kwa n'oké oriri na oké ọṅuṅu, nọ n'ulo ndi-eze.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 7