10. Ndi ezitere we laghachi n'ulo-ya, hu ka aru di orù ahu nma.
11. O rue, mb͕e nwa oge gasiri, na Ọ garuru obodo anākpọ Nain; ndi nēso uzọ-Ya we so Ya ga, ha na oké ìgwè madu.
12. Ma mb͕e Ọ biaruru nso ọnu-uzọ-ama obodo ahu, le, anēbupu otù onye nwuru anwu, bú nwa-nwoke nke nne-ya muru nání ya, nwanyi ahu bu kwa onye di-ya nwuru: oké ìgwè nke ndi obodo ahu soro kwa ya.
13. Mb͕e Onye-nwe-ayi huru ya, O we nwe ọmiko n'aru ya, si ya, Akwala ákwá.
14. O we biaru nso, metu ib͕e ozu ahu aka: ndi nēbu ya we guzo. O we si, Nwa-okorọbia, gi ka M'nāsi, Bilie.
15. Onye ahu nke nwuru anwu we nọlie, malite ikwu okwu. O we were ya nye nne-ya.
16. Madu nile we tua egwu: ha we nye Chineke otuto, si, Onye-amuma uku ebiliwo n'etiti ayi: ha si kwa, Chineke eletawo ndi-Ya.
17. Okwu a bayere Ya we pua gazue na Judia dum, na ala nile di ya gburugburu.
18. Ndi nēso uzọ Jọn we kọrọ ya akukọ bayere ihe ndia nile.