Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 7:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. Mb͕e O kwubìri okwu-Ya nile na nti ndi-Ju, O we ba na Kapanaum.

2. Ma aru adighi orù otù ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise mma, onye di ya oké ọnu-ahia, ọ nọ n'ọnu ọnwu.

3. Mb͕e ọ nuru ihe bayere Jisus, o we zigara Ya ndi-okenye nke ndi-Ju, nārio Ya ka Ọ bia zọputa orù-ya.

4. Ma mb͕e ha biakutere Jisus, ha riọsie Ya ike, si, Ọ bu onye kwesiri ka I mere ya ihe a:

5. n'ihi na ọ nāhu mba-ayi n'anya, ya onwe-ya wukwara ulo-nzukọ-ayi nye ayi.

6. Jisus we so ha ga. Ma mb͕e Ọ nādighi n'ebe di anya n'ulo-ya ub͕u a, ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise we zigara Ya ufọdu ndi-enyì-ya, si Ya, Onye-nwe-ayi, esob͕ula Onwe-gi: n'ihi na erughm ka I ba n'okpuru ulom:

7. n'ihi nka agughm onwem onye kwesiri ibiakute Gi: kama were okwu-ọnu kwue, agēme kwa ka aru onye nējerem ozi di ike.

8. N'ihi na mu onwem bu kwa onye edoro n'okpuru ike, nēnwe ndi-agha n'okpuru mu onwem: m'we si onye a, Ga, ọ ga; m'si kwa onye ọzọ, Bia, ọ bia; m'si kwa orùm, Me nka, o me ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 7