Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 6:35-40 Bible Nso (IGBOB)

35. Ma nāhunu ndi-iro-unu n'anya, nēme-kwa-nu ezi ihe nye ha, nēbinye kwa ihe, ghara iwepu itukwasi-obi; ugwọ-ọlu-unu gādi kwa uku, unu gābu kwa umu nke Onye kachasi ihe nile elu: n'ihi na Ya onwe-ya nwere iru-ọma n'ebe ndi nēnweghi ekele na ndi bu ajọ madu nọ.

36. Nwenu obi-ebere, dika Nna-unu nwere obi-ebere.

37. Ọzọ, unu ekpela ikpé, agaghi-ekpe kwa unu ikpé ma-ọli: unu amakwala ikpé, agaghi-ama kwa unu ikpé ma-ọli: rapunu, agārapu kwa unu:

38. nēnyenu, agēnye kwa unu; ọtùtù ọma, nke abiadaworo ala, yọkọta, nke nējubiga kwa ókè, ka ha gēnye n'obi-unu. N'ihi na ihe unu ji tù ihe ka agēji tùkwara unu ọzọ.

39. O we tukwara ha ilu, si, Ònye-ìsì puru idu onye-ìsì? hà abua agaghi-adabà n'olùlù?

40. Onye nēso uzọ onye-ozizí adighi-aka onye-ozizí-ya: ma onye ọ bula mb͕e emere ya ka o zue okè gādi ka onye-ozizí-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 6