1. O rue na Ọ nāga n'etiti ubi ọka n'ubọchi-izu-ike; ndi nēso uzọ-Ya we nāghọ oko ọka, nāta, nāmazu ha n'aka-ha.
2. Ma ufọdu nime ndi-Farisi siri, Gini mere unu nēme ihe nēzighi ezi n'iwu ime n'ubọchi-izu-ike?
3. Jisus we za ha, si, Ùnu agughi ọbuná ihe a, nke Devid mere, mb͕e agu guru ya, ya onwe-ya na ndi soro ya;