35. Ma ubọchi gābia; mb͕e agānapu kwa ha Onye nālu nwunye ọhu, mb͕e ahu ka ha gēbu ọnu n'ubọchi ahu.
36. O we tu-kwa-ra ha ilu, si, Ọ dighi onye ọ bula nādọkapu iberibe ákwà ọb͕ub͕a n'uwe ọhu tukwasi ya n'uwe ochie; eme otú a, ọ gādọka nke-ọhu, ọzọ kwa, iberibe ákwà ọb͕ub͕a si n'uwe ọhu ahu puta agaghi-adabà na nke-ochie.
37. Ọ dighi kwa onye ọ bula nāb͕aye manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ochie; eme otú a, manya-vine ọhu gāb͕awa karama-akpukpọ, manya onwe-ya gāwusì, karama-akpukpọ ahu gāla kwa n'iyì.
38. Ma aghaghi ib͕aye manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ọhu.
39. Ọzọ kwa, ọ dighi onye ọ bula, mb͕e ọ ṅuworo manya-vine ochie, nāchọ nke-ọhu: n'ihi na ọ si, Nke-ochie di nma.