Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 5:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma o rue, mb͕e ìgwè madu nādagide Ya nānu kwa okwu Chineke, na Ya onwe-ya nēguzo n'usọ ọdọ-miri Genesaret;

2. O we hu ub͕ọ abua ka ha guzoro n'usọ ọdọ-miri ahu: ma ndi-ọkù esiwori nime ha pua, ha nāsa kwa ihe ha ji eb͕u azù.

3. O we ba n'otù nime ub͕ọ abua ahu, nke bu nke Saimon, we kpere ya ka o si n'ala nupu nke-ntà. O we nọdu, si n'ub͕ọ nēzí ìgwè madu nile ihe.

4. Ma mb͕e O kwubìri okwu, Ọ si Saimon, Nupu n'ob͕u-miri, wunyenu ihe unu ji eb͕u azù ka unu b͕ue azù.

5. Saimon we za, si, Nna-ayi, ayi dọb͕uru onwe-ayi n'ọlu ogologo abali a dum, ma ayi eb͕utaghi ihe ọ bula: ma n'okwu-Gi m'gāwuye ihe eji eb͕u azù.

6. Mb͕e ha mesiri nka, ha we nwuta oké ìgwè azù, ihe-ha eji eb͕u azù we nādọka;

7. ha we fere ndi-nketa-ibe-ha aka, bú ndi nọ n'ub͕ọ-ha ọzọ, ka ha bia nyere ha aka. Ha we bia, b͕ujue ub͕ọ̀ abua ahu, ya mere ha malitere imìkpu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 5