Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 3:19-31 Bible Nso (IGBOB)

19. ma Herod, bú tetrarch, ebe Jọn turu ya nmehie-ya n'anya, bú ihe bayere Herodias nwunye nwa-nna-ya, na ihe bayere ajọ ihe nile Herod mere,

20. ọ tukwasi-kwara nka n'elu ihe nile, na o mechibidoro Jọn n'ulo-nkpọrọ.

21. Ma mb͕e emere ndi-Ju nile baptism, o rue, mb͕e emesikwara Jisus baptism, mb͕e Ọ nēkpe kwa ekpere, na emeghere elu-igwe,

22. Mọ Nsọ we fedakwasi Ya n'oyiyi aru, dika nduru, olu we site n'elu-igwe, si, Gi onwe-gi bu Ọkparam M'huru n'anya; ihe-Gi dim ezi mma.

23. Ma Jisus onwe-ya, mb͕e Ọ malitere izí ihe, Ọ b͕ara ihe dika orú arọ na iri, buru Nwa Josef (dika echère), nwa Hili,

24. nwa Matat, nwa Livai, nwa Melkai, nwa Janai, nwa Josef,

25. nwa Matataias, nwa Emos, nwa Nehum, nwa Esli, nwa Nagai,

26. nwa Meath, nwa Matataias, nwa Semein, nwa Josek, nwa Joda,

27. nwa Joanan, nwa Risa, nwa Zerubabel, nwa Shealtiel, nwa Nirai,

28. nwa Melkai, nwa Adai, nwa Kosam, nwa Elmadam, nwa Ia,

29. nwa Jisus, nwa Elieza, nwa Jorim, nwa Matat, nwa Livai,

30. nwa Simeon, nwa Judas, nwa Josef, nwa Jonam, nwa Elaiakim,

31. nwa Melea, nwa Mena, nwa Matata, nwa Netan, nwa Devid,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 3