Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 3:16-26 Bible Nso (IGBOB)

16. Jọn zara, si ha nile, Mu onwem nēji miri me unu baptism n'ezie; ma Onye kam ike nābia, Onye m'nērughi itọpu eriri akpukpọ-ukwu-Ya: Onye ahu gēji Mọ Nsọ na ọku me unu baptism:

17. Onye ihe-ifucha-ọka-Ya di n'aka-Ya, ifuchapu ebe-nzọcha-ọka-Ya nke-ọma, na ikpokọta ọka-Ya n'ọba-Ya; ma Ọ gēji ọku anāpughi imenyu emenyu rechapu ib͕ob͕o.

18. Ya mere o ji ọtutu ndumọdu di iche iche zì ndi-Ju ozi ọma;

19. ma Herod, bú tetrarch, ebe Jọn turu ya nmehie-ya n'anya, bú ihe bayere Herodias nwunye nwa-nna-ya, na ihe bayere ajọ ihe nile Herod mere,

20. ọ tukwasi-kwara nka n'elu ihe nile, na o mechibidoro Jọn n'ulo-nkpọrọ.

21. Ma mb͕e emere ndi-Ju nile baptism, o rue, mb͕e emesikwara Jisus baptism, mb͕e Ọ nēkpe kwa ekpere, na emeghere elu-igwe,

22. Mọ Nsọ we fedakwasi Ya n'oyiyi aru, dika nduru, olu we site n'elu-igwe, si, Gi onwe-gi bu Ọkparam M'huru n'anya; ihe-Gi dim ezi mma.

23. Ma Jisus onwe-ya, mb͕e Ọ malitere izí ihe, Ọ b͕ara ihe dika orú arọ na iri, buru Nwa Josef (dika echère), nwa Hili,

24. nwa Matat, nwa Livai, nwa Melkai, nwa Janai, nwa Josef,

25. nwa Matataias, nwa Emos, nwa Nehum, nwa Esli, nwa Nagai,

26. nwa Meath, nwa Matataias, nwa Semein, nwa Josek, nwa Joda,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 3