Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 24:4-20 Bible Nso (IGBOB)

4. O we rue, mb͕e ha nọ n'obi abua n'ihi nka, le, ndikom abua guzoro ha nso n'uwe nēb͕u àmùmà:

5. ma mb͕e ha nātu egwu, nērube kwa iru-ha n'ala, ha si ha, Gini mere unu nāchọ Onye di ndu n'etiti ndi nwuru anwu?

6. Ọ nọghi n'ebe a, kama emere ka O si n'ọnwu bilie: chetanu otú Ọ gwara unu okwu mb͕e Ọ nọ kwa na Galili,

7. si, na aghaghi irara Nwa nke madu nye n'aka ndikom nēmehie emehie, na aghaghi kwa ikpọgide Ya n'obe, na Ọ ghaghi kwa isi n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ.

8. Ha we cheta okwu-Ya,

9. we si n'ílì ahu laghachi, kọrọ ndi-ozi iri na otù, na ndi nile fọduru, ihe ndia nile.

10. Ma ha bu Meri Magdalini, na Joana, na Meri nne Jemes: ndinyom fọduru ndi soro ha we gwa ndi-ozi-Ya ihe ndia.

11. Okwu ndia we di ka okwu efu n'anya-ha; ha ekweghi kwa ha.

12. Ma Pita biliri, b͕a ọsọ jerue ílì; o we ruru ala, nyo nime ya, we hu ezi ákwà-ozu ahu ka ha tọb͕ọrọ nání ha; o we la n'ulo-ya, ihe nke meworo nēju kwa ya anya.

13. Ma le, ubọchi ahu ndikom abua nime ha nāga otù obodo ntà, aha-ya bu Emeus, nke di ọgu mail atọ site na Jerusalem.

14. Ndi ahu nākparita kwa n'etiti onwe-ha uka bayere ihe ndia nile mereri.

15. O we rue, mb͕e ha nākparita uka nājurita kwa onwe-ha ajuju, Jisus onwe-ya we biarue nso, so kwa ha ga.

16. Ma eb͕ochiri ha anya ka ha ghara ima Ya.

17. O we si ha, Gini bu okwu ndia unu nāgwarita onwe-unu, ka unu nāga ije? Ha we guzo nāb͕aru iru.

18. Otù onye nime ha, aha-ya bu Kleopas, we za, si Ya, Ọ̀ bu nání Gi onwe-gi nọ dika ọbìa na Jerusalem nāmaghi ihe mere nime ya n'ubọchi ndia?

19. Ọ si ha, Ihe gini? Ha si Ya, Ihe bayere Jisus Onye Nazaret, Onye bu onye-amuma di ike n'ọlu na okwu n'iru Chineke na ndi-Ju nile:

20. ya na otú ndi-isi-nchu-àjà na ndi-isi-ayi rara Ya nye ka ama Ya ikpé ọnwu, we kpọgide Ya n'obe.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 24