Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 24:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma n'ubọchi mbu nke ízù ubọchi asa, n'oké isi-ututu, ha biaruru ílì ahu, nēbute uda utọ di iche iche nke ha doziri.

2. Ha we hu nkume ahu na akpọrepuwo ya n'ílì.

3. Ha we ba nime, ma ha ahughi aru nke Onye-nwe-ayi Jisus.

4. O we rue, mb͕e ha nọ n'obi abua n'ihi nka, le, ndikom abua guzoro ha nso n'uwe nēb͕u àmùmà:

5. ma mb͕e ha nātu egwu, nērube kwa iru-ha n'ala, ha si ha, Gini mere unu nāchọ Onye di ndu n'etiti ndi nwuru anwu?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 24