51. (onye ahu ekweyeghi ìzù-ha na omume-ha), onye sitere n'Arimatia, otù obodo ndi-Ju, onye nēche ala-eze Chineke:
52. onye ahu jekuru Pailat, riọ aru Jisus.
53. O we budata ya, ke ya n'ezi ákwà ọcha, we tọb͕ọ Ya n'ílì nke egwuwara ya-ri na nkume, nke akātọb͕ọghi onye ọ bula nime ya.
54. Ma ọ bu ubọchi Nkwadebe, ubọchi-izu-ike nēru kwa nso.
55. Ndinyom, ndi si na Galili soro Ya bia, we so n'azu, le ílì ahu, na otú atọb͕ọrọ aru-Ya.