Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 23:49-56 Bible Nso (IGBOB)

49. Ndi nile ndi mara Ya nke-ọma, na ndinyom ndi soro Ya site na Galili, guzokwara n'ebe di anya, nēle ihe ndia.

50. Ma le, otù nwoke, aha-ya bu Josef, onye bu onye-nnọkọ-ikpé, ọ bu ezi nwoke buru kwa onye ezi omume,

51. (onye ahu ekweyeghi ìzù-ha na omume-ha), onye sitere n'Arimatia, otù obodo ndi-Ju, onye nēche ala-eze Chineke:

52. onye ahu jekuru Pailat, riọ aru Jisus.

53. O we budata ya, ke ya n'ezi ákwà ọcha, we tọb͕ọ Ya n'ílì nke egwuwara ya-ri na nkume, nke akātọb͕ọghi onye ọ bula nime ya.

54. Ma ọ bu ubọchi Nkwadebe, ubọchi-izu-ike nēru kwa nso.

55. Ndinyom, ndi si na Galili soro Ya bia, we so n'azu, le ílì ahu, na otú atọb͕ọrọ aru-Ya.

56. Ha we laghachi, dozie uda utọ di ichi iche na manu-otite.N'ubọchi-izu-ike ha we nọdu nwayọ dika ihe enyere n'iwu si kwu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 23