Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 23:23-28 Bible Nso (IGBOB)

23. Ma ha were oké olu rugide, nāriọ ka akpọgide Ya n'obe. Olu-ha we kari ya ike.

24. Pailat we kpebì ka eme ihe ha riọrọ.

25. O we rapuru ha onye ahu atubàrari n'ulo-nkpọrọ n'ihi nbili imegide ndi-isi na ib͕u-madu, onye ha riọrọ n'aka-ya; ma ọ rara Jisus nye ka eme Ya ihe ha chọrọ.

26. Mb͕e ha nēdupu Ya, ha we jide otù onye, bú Saimon, onye Sairini, nke si n'azu obodo ahu bia, ha we bokwasi ya obe-Ya, ka o buru ya so Jisus.

27. Oké ìgwè ndi-Ju nēso kwa Ya, ya na ìgwè ndinyom ndi nēti aka n'obi nākwa-kwa-ra Ya ákwá.

28. Ma Jisus chighariri n'ebe ha nọ, si, Umu-nwanyi Jerusalem, unu akwalaram ákwá, kama nākwaranu onwe-unu na umu-unu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 23