Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 23:17-30 Bible Nso (IGBOB)

17. Ma ọ di ya nkpà irapuru ha otù onye-nkpọrọ n'ememe.

18. Ma ha nile tiri nkpu n'otù, si, Wepu Nwoke a, ma rapuru ayi Barabas:

19. onye atubàra n'ulo-nkpọrọ n'ihi otù nbili imegide ndi-isi ebiliri nime obodo ahu, ya na ib͕u-madu.

20. Pailat we gwa ha okwu ọzọ, ebe ọ nāchọ irapu Jisus;

21. ma ha tiri nkpu, si, Kpọgide Ya n'obe, kpọgide Ya n'obe.

22. O we si ha nke ub͕ò atọ, É-è, n'ìhi na Onye a mere ihe ọjọ gini? Ahughm ihe kwesiri inwu anwu n'aru Ya: ya mere m'gādọ Ya aka na nti, we rapu Ya.

23. Ma ha were oké olu rugide, nāriọ ka akpọgide Ya n'obe. Olu-ha we kari ya ike.

24. Pailat we kpebì ka eme ihe ha riọrọ.

25. O we rapuru ha onye ahu atubàrari n'ulo-nkpọrọ n'ihi nbili imegide ndi-isi na ib͕u-madu, onye ha riọrọ n'aka-ya; ma ọ rara Jisus nye ka eme Ya ihe ha chọrọ.

26. Mb͕e ha nēdupu Ya, ha we jide otù onye, bú Saimon, onye Sairini, nke si n'azu obodo ahu bia, ha we bokwasi ya obe-Ya, ka o buru ya so Jisus.

27. Oké ìgwè ndi-Ju nēso kwa Ya, ya na ìgwè ndinyom ndi nēti aka n'obi nākwa-kwa-ra Ya ákwá.

28. Ma Jisus chighariri n'ebe ha nọ, si, Umu-nwanyi Jerusalem, unu akwalaram ákwá, kama nākwaranu onwe-unu na umu-unu.

29. N'ihi na le, ubọchi nābia, mb͕e ha gāsi, Ngọzi nādiri ndinyom àgà, na afọ nke nāmughi nwa, na ara nke nāzùghi nwa.

30. Mb͕e ahu ka ha gāmalite isi ugwu, Dakwasinu ayi; na isi ugwu ntà, Kpuchienu ayi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 23