Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 23:11-19 Bible Nso (IGBOB)

11. Herod, ya na ndi-agha-ya, we me Ya ka Ọ buru ihe-efu, o me-kwa-ra Ya ihe-ọchì, we b͕okwasi Ya uwe mara nma nke-uku we zighachi Ya jekuru Pailat.

12. Herod na Pailat we me eyì n'etiti onwe-ha n'ubọchi ahu: n'ihi na n'oge gara aga ha bu ndi-iro.

13. Pailat we kpọkọ ndi-isi-nchu-àjà na ndi-isi na ndi-Ju,

14. si ha, Unu kutaram Nwoke a, dika onye nēduhie ndi-Ju: ma le, mu onwem kpere Ya ikpé n'iru unu, ma ahughim ihe ọ bula n'aru Nwoke a kwesiri ahuhu-nmehie n'ihe nile unu ji bo Ya ebubo:

15. é-è, ọbuná Herod ahugh: n'ihi na o zighachiri Ya nye ayi; le kwa, ọ dighi ihe ọ bula kwesiri ọnwu nke O meworo.

16. Ya mere, m'gādọ Ya aka na nti, we rapu Ya.

17. Ma ọ di ya nkpà irapuru ha otù onye-nkpọrọ n'ememe.

18. Ma ha nile tiri nkpu n'otù, si, Wepu Nwoke a, ma rapuru ayi Barabas:

19. onye atubàra n'ulo-nkpọrọ n'ihi otù nbili imegide ndi-isi ebiliri nime obodo ahu, ya na ib͕u-madu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 23