Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 20:8-13 Bible Nso (IGBOB)

8. Jisus we si ha, Mu onwem agaghi-agwa kwa unu aha ike M'ji eme ihe ndia.

9. O we malite ituru ndi-Ju ilu a: Otù onye kuru ubi-vini, were kwa ya tiye n'aka ndi-ọlu-ubi, we je ala ọzọ nọdu oge di anya.

10. N'oge ighọ nkpuru o we zigara ndi-ọlu-ubi ahu otù orù, ka ha we nye ya nkpuru ufọdu nke ubi-vine ahu: ma ndi-ọlu-ubi ahu piara ya ihe, zilaga ya n'aka efu.

11. O we zikwasi orù ọzọ: ha we pia kwa ya ihe, me ya ihe-ihere, zilaga ya n'aka efu.

12. O we zikwasi orù nke-atọ: ha we meru kwa onye ahu aru, we tupu ya.

13. Onye-nwe ubi-vine ahu we si, Gini ka m'gēme? m'gēziga ọkparam m'huru n'anya: eleghi anya ha gāsọpuru nwam nka.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 20