Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 20:18-31 Bible Nso (IGBOB)

18. Agētiwasi onye ọ bula nke dakwasiri nkume ahu; ma onye ọ bula ọ gādakwasi ya, ọ gēfesa ya ka uzuzu.

19. Ndi-ode-akwukwọ na ndi-isi-nchu-àjà we chọ uzọ itukwasi Ya aka n'otù oge hour ahu; ma ha turu egwu ndi-Ju: n'ihi na ha mara na Ọ turu ilu a imegide ha.

20. Ha we che Ya nche, we zipu ndi-nledo, ndi mere onwe-ha dika ndi ezi omume, ka ha we jide Ya n'okwu-ọnu-Ya, irara Ya nye n'aka ọchichi na ike nke onye-isi.

21. Ha we jua Ya, si, Onye-ozizí, ayi amatawo na I nēkwu nēzi kwa ihe ziri ezi, na I dighi-ele kwa madu anya n'iru, kama I nēzí uzọ Chineke n'ezi-okwu:

22. Ò ziri ezi n'iwu ka ayi tu ùtú nye Sisa, ma-ọbu na ò zighi ezi?

23. Ma Ọ matara aghughọ-ha, we si ha,

24. Gosinum otù shilling. Ònyinyo na ihe-ndekwasi nke onye ka o nwere? Ha si, Nke Sisa.

25. O we si ha, Ya mere, nyeghachinu Sisa ihe nke Sisa, nyeghachi-kwa-nu Chineke ihe nke Chineke.

26. Ha enweghi kwa ike ijide okwu-Ya n'iru ndi-Ju: ọziza-Ya we ju ha anya, ha we kpuchie ọnu-ha.

27. Ufọdu n'etiti ndi-Sadusi, ndi si na nbilite-n'ọnwu adighi, we biakute Ya; ha we jua Ya,

28. si, Onye-ozizí, Moses dere akwukwọ nye ayi, si, na ọ buru na nwa-nne-nwoke onye ọ bula anwua, mb͕e o nwere nwunye, ma onye ahu enweghi nwa, ka nwa-nne-ya nwoke kuru nwunye-ya, me ka nkpuru toputara nwa-nne-ya.

29. Ya mere, umu-nne-ndikom asa di: nke-mbu luru nwunye, we nwua nēnweghi nwa;

30. nke-abua kwa;

31. nke-atọ we kuru ya; otú ahu ha asa arapughi umu, we nwua.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 20