Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 20:11-16 Bible Nso (IGBOB)

11. O we zikwasi orù ọzọ: ha we pia kwa ya ihe, me ya ihe-ihere, zilaga ya n'aka efu.

12. O we zikwasi orù nke-atọ: ha we meru kwa onye ahu aru, we tupu ya.

13. Onye-nwe ubi-vine ahu we si, Gini ka m'gēme? m'gēziga ọkparam m'huru n'anya: eleghi anya ha gāsọpuru nwam nka.

14. Ma mb͕e ndi-ọlu-ubi ahu huru ya, ha kwurita n'etiti onwe-ha, si, Nka bu onye-nketa: ka ayi b͕ue ya, ka ihe-nketa-ya we buru nke ayi.

15. Ha we tupu ya n'azu ubi-vine ahu, b͕ue ya. Gini kwa ka onye-nwe ubi-vine ahu gēme ha?

16. Ọ gābia, la ndi-ọlu-ubi ahu n'iyì, were kwa ubi-vine ahu nye ndi ọzọ. Ma mb͕e ha nuru ya, ha si, Chineke ekwela.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 20