Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 2:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma o rue na mb͕e ahu, iwu si n'ebe Sisa Ọgọstọs nọ puta na agēde aha madu nile bi n'elu-uwa dum madu bi n'akwukwo.

2. Nka bu odide-aha mbu edere mb͕e Kwiriniọs bu onye nāchi Siria.

3. Madu nile we ga ka ede aha-ha n'akwukwọ, onye ọ bula ọ ga obodo nke aka ya.

4. Josef we si kwa na Galili, site n'obodo Nazaret, rigo na Judia, ba n'obodo Devid nke anākpọ Betlehem, n'ihi na o si n'ulo na agburu Devid puta;

5. ka o we me ka ede aha ya na Meri n'akwukwọ, bú nwanyi ekwere na ọ gālu, onye di kwa ime.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 2