Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 19:29-46 Bible Nso (IGBOB)

29. O rue, mb͕e Ọ biaruru Betfagi na Betani nso, n'uzọ ugwu anākpọ ugwu Olive, na O zigara madu abua n'etiti ndi nēso uzọ-Ya,

30. si, Jenu n'obodo ntà nke di na ncherita-iru unu; mb͕e unu nābà, unu gāhu nime ya nwa-inyinya-ibu elibeworo, nke madu ọ bula akānọkwasigh: tọpunu ya, sekputa ya.

31. Ọ buru kwa na onye ọ bula ajua unu, si, N'ìhi gini ka unu nātọpu ya? unu gāsi otú a, Ọ di Onye-nwe-ayi nkpà.

32. Ndi ezigara we je, hu dika Ọ gwara ha.

33. Ma mb͕e ha nātọpu nwa-inyinya-ibu ahu, ndi-nwe-ya we si ha, Gini mere unu nātopu nwa-inyinya-ibu ahu?

34. Ha we si, Ọ di Onye-nwe-ayi nkpà.

35. Ha we sekputa ya nye Jisus: ha we wukwasi uwe-ha na nwa-inyinya-ibu ahu, we tukwasi Jisus na ya.

36. Mb͕e Ọ nāga, ha we tusa uwe-ha n'uzọ.

37. Ma mb͕e Ọ nābiaru Jerusalem nso ub͕u a, n'uzọ nrida nke ugwu Olive, ọra ndi nile nēso uzọ-Ya malitere iṅuri ọṅu na iwere oké olu to Chineke n'ihi ọlu nile di ike nke ha hururi;

38. si, Onye agọziri agọzi ka Eze Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi bu: udo di n'elu-igwe, otuto di kwa n'ebe kachasi ihe nile elu.

39. Ufọdu n'etiti ndi-Farisi we si n'ìgwè madu ahu si Ya, Onye-ozizí, bara ndi nēso uzọ-Gi nba.

40. O we za, si, Asim unu na, ọ buru na ndia ekpuchi ọnu-ha, nkume gēti nkpu.

41. Mb͕e Ọ biaruru Jerusalem nso, O we hu obodo ahu we kwara ya ákwá,

42. si, Ọ buru na i mara n'ubọchi a, ọbuná gi onwe-gi, ihe gēweta udo! ma ub͕u a ezonariri ha n'anya-gi.

43. N'ihi na ubọchi gābiakwasi gi, mb͕e ndi-iro-gi gēgwu ékpè na ìgá imegide gi, nọgide kwa gi gburugburu, jigide kwa gi n'akuku nile,

44. tuda kwa gi n'ala, na umu-gi bi nime gi; ha agaghi-arapu kwa nime gi otù nkume n'elu nkume-ibe-ya; n'ihi na i maghi oge nleta-gi.

45. O wee ba n'ulọ uku Chineke, malite ichupu ndi nēre,

46. nāsi ha, Edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ulom gābu kwa ulo ekpere: ma unu onwe-unu mere ya ọb͕à ndi nāpunara madu ihe.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 19