Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 18:27-43 Bible Nso (IGBOB)

27. Ma Ọ siri, Ihe anāpughi ime n'ebe madu nọ apuru ime n'ebe Chineke nọ.

28. Pita we si, Le, ayi onwe-ayi rapuru ihe nile nke aka ayi, we so Gi.

29. O we si ha, N'ezie asim unu, Ọ dighi onye ọ bula nke rapuru ulo, ma-ọbu nwunye, ma-ọbu umu-nne, ma-ọbu ndi muru ya, ma-ọbu umu, n'ihi ala-eze Chineke,

30. nke nāgaghi-anata kari ọtutu ihe n'oge a, nata kwa ndu ebighi-ebi n'oge nke nābia.

31. O we kuru ndi-ozi iri na abua ahu tiyere Onwe-ya, si ha, Le, ayi nārigoro Jerusalem, ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ site n'aka ndi-amuma gēmezu n'ebe Nwa nke madu nọ.

32. N'ihi na agārara Ya nye n'aka ndi mba ọzọ, me kwa Ya ihe-ọchì, me kwa Ya ihe-ihere, busa kwa Ya ọnu-miri:

33. ha gāpia kwa Ya ihe, b͕ue Ya: n'ubọchi nke-atọ Ọ gēsi kwa n'ọnwu bilie.

34. Ma ndi ahu aghọtaghi ihe ọ bula n'ihe ndia; ezonari-kwa-ra ha okwu a, ha amaghi kwa ihe anēkwu.

35. O rue, mb͕e Ọ nābiaru Jeriko nso, otù onye-ìsì nānọdu n'akuku uzọ nāriọ aririọ:

36. ma ebe ọ nuru ùzù ìgwè madu ka ha nāgabiga, ọ jua isi ihe a.

37. Ha we kọrọ ya, na Jisus Onye Na-zaret nāgabiga.

38. O we tie nkpu, si, Jisus, Nwa Devid, merem ebere.

39. Ndi bu uzọ ga we bara ya nba, ka o kpuchie ọnu-ya: ma onye ahu tikariri nkpu nke-uku, si, Nwa Devid, merem ebere.

40. Jisus we guzo, si ka eduru ya biakute Ya: ma mb͕e ọ biara nso, Ọ jua ya, si,

41. Gini ka i nāchọ ka M'mere gi? Ọ́ si, Onye-nwe-ayi, ka eme ka m'hu uzọ.

42. Jisus we si ya, Ka eme ka i hu uzọ: okwukwe-gi azọputawo gi.

43. Ngwa ngwa ewe me ka ọ hu uzọ, o we nēso Ya, nēnye Chineke otuto: ndi-Ju nile, mb͕e ha huru ya, ha we to Chineke.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 18