Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 17:33-37 Bible Nso (IGBOB)

33. Onye ọ bula nke gāchọ uzọ izutara onwe-ya ndu-ya, o gētufu ya: ma onye ọ bula nke gētufu ndu-ya gēme ya ka ọ di ndu.

34. Asim unu, N'abali ahu madu abua gādi n'elu otù ihe-ndina; agēwere otù nime ha, rapu ibe-ya.

35. Ndinyom abua ganēgwekọ nri n'otù ebe; agēwere otù nime ha, ma agārapu ibe-ya.

36. Madu abua gāno kwa n'ubi; agēwere otù rapu kwa ibe-ya.

37. Ha we za, si Ya, Òle ebe, Onye-nwe-ayi? Ọ si ha, Ebe ozu di, n'ebe ahu ka udele gēzukọ kwa.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 17