27. Ha nēri ihe, ha nāṅu ihe-ọṅuṅu, ha nālu nwunye, anēnye ha n'ọlulu-di, rue ubọchi Noa batara n'ub͕ọ-ya, oké iju-miri ahu we bia, la ha nile n'iyì.
28. Otú ahu dika emere n'ubọchi Lot; ha nēri ihe, ha nāṅu ihe-ọṅuṅu, ha nāzú, ha nēre, ha nāku ihe n'ubi, ha nēwu ulo;
29. ma n'ubọchi Lot siri na Sọdọm puta ọku na brimstone si n'elu-igwe zò, we la ha nile n'iyì:
30. n'otù aka ahu ka ọ gādi n'ubọchi agēkpughe Nwa nke madu.
31. N'ubọchi ahu, onye gānọ n'elu ulo, ma ihe-ya di nime ulo, ya ghara iridata ikwapu ha: otú ahu onye nọ kwa n'ubi, ya ghara ilaghachi.
32. Chetanu nwunye Lot.
33. Onye ọ bula nke gāchọ uzọ izutara onwe-ya ndu-ya, o gētufu ya: ma onye ọ bula nke gētufu ndu-ya gēme ya ka ọ di ndu.
34. Asim unu, N'abali ahu madu abua gādi n'elu otù ihe-ndina; agēwere otù nime ha, rapu ibe-ya.
35. Ndinyom abua ganēgwekọ nri n'otù ebe; agēwere otù nime ha, ma agārapu ibe-ya.