Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 17:18-26 Bible Nso (IGBOB)

18. Àhughi ndi laghachiri inye Chineke otuto, ma-ọbughi onye ala ọzọ a?

19. O we si ya, Bilie, ga nke gi: okwukwe-gi azọputawo gi.

20. Ma mb͕e ndi-Farisi juru Ya mb͕e ala-eze Chineke gābia, Ọ zara ha, si, Ala-eze Chineke adighi-abia mb͕e madu nēche nche:

21. ha agaghi-asi kwa, Le, n'ebe a! ma-ọbu, N'ebe ahu! n'ihi na le, ala-eze Chineke di n'etiti unu.

22. O we si ndi nēso uzọ-Ya, Ubọchi gāba, mb͕e agu ihu otù nime ubọchi Nwa nke madu gāgu unu, ma unu agaghi-ahu ya.

23. Ha gāsi kwa unu, Le, n'ebe ahu! Le, n'ebe a! unu ejela, unu esokwala ha:

24. n'ihi na dika àmùmà, mb͕e ọ nēb͕u àmùmà site n'otù akuku n'okpuru elu-igwe, ọ nēnwu rue akuku ọzọ n'okpuru elu-igwe; otú a ka Nwa nke madu gādi n'ubọchi-Ya.

25. Ma Ọ ghaghi ibu uzọ hu ọtutu ahuhu, aghaghi kwa iju Ya site n'ọb͕ọ a.

26. Ma dika emere n'ubọchi Noa, otú a ka ọ gādi kwa n'ubọchi Nwa nke madu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 17