Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 17:10-20 Bible Nso (IGBOB)

10. Otú a unu onwe-unu kwa, mb͕e ọ bula unu gēmesi ihe nile akaworo àkà nye unu, sinu, Ayi bu orù ndi nābaghi n'ihe; ayi emewo ihe ayi ji ugwọ ime.

11. O rue, mb͕e ha nāga Jerusalem, na Ya onwe-ya nāgabiga n'etiti Sameria na Galili.

12. Mb͕e Ọ nābà n'otù obodo ntà, ndikom iri, bú ndi-ekpenta, we zute Ya, ndi guzoro n'ebe di anya:

13. ha we welie olu-ha elu, si, Jisus, Nna-ayi, mere ayi ebere.

14. Mb͕e Ọ huru ha, O we si ha, Ganu, were onwe-unu gosi ndi-nchu-àjà. O we rue, mb͕e ha nāga, na emere ka aru-ha di ọcha.

15. Ma otù onye n'etiti ha, mb͕e ọ huru na emere ka aru di ya ike, ọ laghachi, were oké olu nenye Chineke otuto;

16. o we da kpuchie iru-ya n'ala n'ukwu-Ya, nēkele Ya: onye ahu bu kwa onye Sameria.

17. Ma Jisus zara, si, Èmeghi ka aru ndikom iri ahu di ọcha? ma òle ebe iteghete fọduru no?

18. Àhughi ndi laghachiri inye Chineke otuto, ma-ọbughi onye ala ọzọ a?

19. O we si ya, Bilie, ga nke gi: okwukwe-gi azọputawo gi.

20. Ma mb͕e ndi-Farisi juru Ya mb͕e ala-eze Chineke gābia, Ọ zara ha, si, Ala-eze Chineke adighi-abia mb͕e madu nēche nche:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 17