Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 17:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. O we si ndi nēso uzọ-Ya, Ọ bu ihe nāghaghi ime na ihe di ìche iche nēme ka madu ma n'ọnyà gābia: ma ahuhu gādiri onye ahu, nke ha nēsite n'aka-ya bia.

2. Ọ gakara ya-ri mma ma akwuba ya nkume-igwe-nri n'olu, tubà kwa ya n'oké osimiri, kari na ọ gēme ka otù onye nime ndi ntà ndia ma n'ọnyà.

3. Nēzenu onwe-unu: ọ buru na nwa-nna-gi emehie, bara ya nba; ọ buru kwa na ọ chègharia, b͕aghara ya.

4. Ọ buru kwa na o mehiere megide gi ub͕ò asa n'otù ubọchi, we chigharia ọzọ n'ebe i nọ ub͕ò asa, si, Echègharim; i gāb͕aghara ya.

5. Ndi-ozi-Ya we si Onye-nwe-ayi, Tukwasiri ayi okwukwe.

6. Onye-nwe-ayi we si, Ọ buru na unu nwere okwukwe dika nkpuru mustard, unu gāsi osisi sycamine nka, Ka eropu gi, ku kwa gi n'oké osimiri; ọ gāṅa kwa unu nti.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 17