16. Iwu Chineke na ndi-amuma-Ya di rue oge Jọn: site n'oge ahu anēzisa ozi ọma ala-eze Chineke, madu nile n'otù n'otù were ihe-ike nābà nime ya.
17. Ma ọ ka nfé ka elu-igwe na ala gabiga, kari na otù ihe dikarisiri ntà n'iwu ahu gāda.
18. Nwoke ọ bula nke nārapu nwunye-ya, nke luru kwa nwanyi ọzọ, ọ nākwa iko: onye nālu nwanyi nke di-ya rapuworo nākwa kwa iko.
19. Ma otù ọgaranya di, o nēyi kwa uwe ododo na ezi ákwà ọcha, ọ nēme kwa ka obi nātọ ya utọ nke-ọma kwa-ubọchi:
20. ma atọb͕ọrọri otù ob͕eye n'ọnu-uzọ-amá-ya, aha-ya bu Lazarọs, nke ọnyá juru ya n'aru,
21. onye ọ nāgu kwa ka ewere irighiri nri nke si na table nke ọgaranya ahu dapu me ka afọ ju ya; e, ọbuná nkita nābia racha ọnyá-ya.