Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 16:1-12 Bible Nso (IGBOB)

1. O we si kwa ndi nēso uzọ-Ya, Otù ọgaranya di, nke nwere onye nāchi èzí-na-ulo-ya; onye a ka eboro n'iru ya na ọ nēmefu ihe o nwere.

2. Ọ we kpọ ya, si ya, Ọ̀ bu gini bu nka nke m'nānu bayere gi? kọrọm akukọ nke ọchichi-èzí-na-ulo-gi; n'ihi na i pughi ichi èzí-na-ulo ọzọ.

3. Onye ahu nke nāchi èzí-na-ulo we kwue n'onwe-ya, si, Gini ka m'gēme, n'ihi na onye-nwem nānapum ọchichi-èzí-na-ulo a? Enweghi m ike igwu ala; ihere iriọ aririọ nēmem.

4. Amaram ihe m'gēme, ka, mb͕e ọ bula agēwepum n'ọchichi-èzí-na-ulo a, ka ha we kpọbatam n'ulo nke aka ha.

5. O we kpọ ndi nile ji onye-nwe-ya ugwọ n'otù n'otù, si onye mbu, Ùgwọ ole ka i ji onye-nwem?

6. Ọ si, Ọgu mb͕é manu ise. Ọ si ya, Were akwukwọ-gi, nọdu ọsọsọ, de ọgu abua na iri.

7. Mb͕e ahu ọ siri onye ọzọ, Ùgwọ ole ka gi onwe-gi ji kwa? Ọ si, Ọgu mb͕é ọka ise. Ọ si ya, Were akwukwọ-gi, de ọgu anọ.

8. Onye-nwe-ya we to onye ahu nāchi èzí-na-ulo nke nēme ajọ omume, n'ihi na o mere dika onye nwere uche: n'ihi na umu nke oge a nwere uche n'ebe ọb͕ọ nke aka ha nọ kari umu nke ìhè.

9. Mu onwem nāsi kwa unu, Menu ndi-eyi nye onwe-unu site n'àkù nke ajọ omume; ka, mb͕e ọ bula ọ gāgwu, ka ha we kpọbata unu n'ulo-ikwū ebighi-ebi.

10. Onye kwesiri ka atukwasi ya obi n'ihe dikarisiri ntà kwesi-kwa-ra ka atukwasi ya obi n'oké ihe: onye bu kwa onye ajọ omume n'ihe dikarisiri ntà bu kwa onye ajọ omume n'oké ihe.

11. Ya mere, ọ buru na unu abughi ndi kwesiri ka atukwasi unu obi n'àkù ajọ omume, ònye gēnye ezi àkù n'aka-unu na ntukwasi-obi idebe?

12. Ọ buru kwa na unu abughi ndi kwesiri ka atukwasi unu obi n'ihe onye ọzọ nwere, ònye gēnye unu ihe nke aka unu?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 16