Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 15:11-22 Bible Nso (IGBOB)

11. O we si, Otù nwoke ji umu-ndikom abua:

12. nke bu nwata nime ha we si nna-ya, Nna, nyem òkè nke ihe i nwere nke rurum. O we kewara ha ihe nile o ji biri.

13. Mb͕e ọtutu ubọchi agabigaghi nwa-ya nke-nwata ahu we kporo ihe nile, je ala ọzọ di anya; n'ebe ahu ka o mefuru ihe o nwere n'idi ndu nke ila-n'iyì.

14. Ma mb͕e o mefusiri ihe nile, oké unwu siri ike dara n'ala ahu; ya onwe-ya we malite inọ na nkpà.

15. O we ga were onwe-ya rapara n'otù onye nime ndi amuru n'ala ahu; o we ziga ya n'ubi-ya izù ezì.

16. O we nāgu ya iwere mb͕ub͕ọ nke ezì nāta riju afọ-ya: ma ọ dighi onye ọ bula nēnye ya.

17. Ma mb͕e ọ mara onwe-ya ọ si, Ọ̀tutu ndi egoro ọlu ole nke nnam nwebigara ob͕e achicha ókè, ma mu onwem nāla n'iyì n'oké agu n'ebe a!

18. M'gebili jekuru nnam, m'gāsi kwa ya, Nna, emehiewom megide elu-igwe, na n'iru gi:

19. ekwesighi m ka akpọkwam nwa-gi ọzọ: mem ka m'di ka otù onye nime ndi nke gi egoro ọlu.

20. O we bilie, biakute nna-ya. Ma mb͕e ọ nọ n'ebe di anya ub͕u a, nna-ya huru ya, o we nwe ọmiko n'aru-ya, b͕a ọsọ, makua ya n'olu, sutu kwa ya ọnu nke-uku.

21. Nwa-ya we si ya, Nna, emehiewom megide elu-igwe, na n'iru gi: ekwesighi m ka akpọkwam nwa-gi ọzọ.

22. Ma nna-ya siri ndi-orù-ya, Chiputa uwe-nwuda nke kachasi nma ọsọsọ, were ya yikwasi ya; tiye kwa nb͕a-aka n'aka-ya, na akpukpọ-ukwu n'ukwu-ya:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 15