Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 15:1-13 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma ndi-ọna-utu na ndi-nmehie nile nābiaru Ya nso inu okwu-Ya.

2. Ndi-Farisi na ndi-ode-akwukwọ we nātamu, si Nwoke a nānara ndi-nmehie nke-ọma, nēso kwa ha eri ihe.

3. O we tuara ha ilu a, si,

4. Òle madu di n'etiti unu, nke nwere ọgu aturu ise, ma otù nime ha funariri ya, nke nārapughi ọgu anọ na iri na iteghete ahu n'ọhia, ga so nke furu efu, rue mb͕e ọ gāchọputa ya?

5. Mb͕e ọ chọputaworo ya, we tukwasi ya n'ùbú-ya abua, nāṅuri.

6. Mb͕e ọ biaworo n'ulo, o we kpọkọta ndi-eyì-ya na ndi-ab͕ata-obi-ya, si ha, Sonum ṅuri ọṅu, n'ihi na achọputawom aturum furu efu.

7. Asim unu, na otú a ọṅu gādi n'elu-igwe n'isi otù onye-nmehie nke nēchèghari, kari n'isi ọgu ndi ezi omume anọ na iri na iteghete, ndi nchèghari nādighi nkpà.

8. Ma-ọbu òle nwanyi nke nwere shilling iri, ọ buru na otù shilling efunari ya, nāmuyeghi oriọna, za ulo-ya, chọsi ike rue mb͕e ọ gāchọputa ya?

9. Mb͕e ọ chọputaworo ya, o we kpọkọta ndi-eyì-ya na ndi-ab͕ata-obi-ya, si, Sonum ṅuri ọṅu, n'ihi na achọputawom shilling nke funariworom-ri.

10. Asim unu, na otù a ọṅù di n'iru ndi-mọ-ozi Chineke n'isi otù onye-nmehie nke nēchèghari.

11. O we si, Otù nwoke ji umu-ndikom abua:

12. nke bu nwata nime ha we si nna-ya, Nna, nyem òkè nke ihe i nwere nke rurum. O we kewara ha ihe nile o ji biri.

13. Mb͕e ọtutu ubọchi agabigaghi nwa-ya nke-nwata ahu we kporo ihe nile, je ala ọzọ di anya; n'ebe ahu ka o mefuru ihe o nwere n'idi ndu nke ila-n'iyì.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 15