Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 14:15-35 Bible Nso (IGBOB)

15. Ma mb͕e otù onye nime ndi soro Ya nọdu na nri nuru ihe ndia, ọ si Ya, Ngọzi nādiri onye gēri nri n'ala-eze Chineke.

16. Ma Ọ siri ya, Otù nwoke siri nri-anyasi uku; we kpọ ọtutu madu:

17. o we zipu orù-ya n'oge hour nke nri-anyasi ahu isi ndi akpọwori, Bianu; n'ihi na edoziwo ihe nile ab͕u a.

18. Ma ha nile were otù olu malite iriọ ka arapu ha. Onye mbu siri ya, Azutaram ubi, ọ dikwam nkpà ipu gāle ya: ariọm gi guam n'onye riọrọ ka arapu ya.

19. Onye ọzọ si-kwa-ra, Azutaram ehi ọlu iri ejikọrọ abua abua, anamaga kwa inwa ha: ariọm gi guam n'onye riorọ ka arapu ya.

20. Onye ọzọ sikwara, Alurum nwunye, n'ihi nka apughi m ibia.

21. Orù ahu we bia, kọrọ onye-nwe-ya ihe ndia. Mb͕e ahu nna-nwe-ulo ahu, ebe iwe were ya, ọ si orù-ya, Pua ọsọsọ ga n'amá nile na uzọ ntà nile nke obodo, kpọbata n'ebe a ndi-ob͕eye na ndi-ọlusi na ndi-ìsì na ndi-ngwurọ.

22. Orù ahu we si, Onye-nwe-ayi, emewo ihe i nyere n'iwu, ọnọdu fọdu-kwa-ra.

23. Onye-nwe-ulo ahu we si orù-ya Pua ga n'uzọ nile na ogige nile, rugide kwa madu ka ha bata, ka ulom we juputa.

24. N'ihi na asim unu, na ọ dighi otù onye nime ndikom ahu ndi akpọworo gēdetu nri-anyasim ire.

25. Ma oké ìgwè madu nēso ya je: O we chigharia, si ha,

26. Ọ buru na onye ọ bula abiakutem, ma ọ kpọghi nna nke ya asì, ya na nne nke ya, na nwunye nke ya, na umu nke ya, na umu-nne-ndikom nke ya, na umu-nne-ndinyom nke ya, e, ndu nke aka ya kwa, ọ pughi ibu onye nēso uzọm.

27. Onye ọ bula nke nēbughi obe nke aka ya, sokwam n'azu, ọ pughi ibu onye nēso uzọm.

28. N'ihi na ònye nime unu, nke nāchọ íwu ulo-elu, nēbughi uzọ nọdu ala gu ego ọ gēwe, ma o nwere ego ọ gēji lusia ya?

29. Ka ndi nile ndi nāhu ya we ghara imalite ime ya ihe-ọchì ma eleghi anya, mb͕e ọ tọsiri ntọ-ala-ya, ma o nweghi ike iwuzu ya,

30. si, Nwoke a malitere iwu ulo, ma o nweghi ike iwusi ya.

31. Ma-ọbu òle eze, mb͕e ọ nāga ibu agha megide eze-ibe-ya, nāgaghi-ebu uzọ nọdu ala b͕a ìzù ma ọ puru ichi orú nnù ndi-agha na nnù ise zute onye chiri ọgu nnù ndi-agha abua na nnù iri bia imegide ya?

32. Ma ọ buru na ọ pughi, mb͕e onye ahu nọ n'ebe di anya ub͕u a, o ziga ndi-ozi, riọ ihe gēweta udo.

33. Ya mere otú a, onye ọ bula nime unu nke nāb͕akutaghi ihe nile o nwere azú, ọ pughi ibu onye nēso uzọm.

34. Ya mere, nnú di nma: ma asi na ọbuná nnú etufuwo utọ-ya, àgēji gini me ya ka ọ di utọ?

35. O kwesighi ala ma-ọbu ebe anēkpofu ǹsí-anu: ha nātupu ya n'èzí. Onye nwere nti inu ihe, ya nuru.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 14