Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 14:13-25 Bible Nso (IGBOB)

13. Kama mb͕e ọ bula i siri nri uku, kpọ ndi-ob͕eye, ndi-ọlusi, ndi-ngwurọ, ndi-ìsì:

14. onye-ngọzi ka i gābu; n'ihi na ha enweghi ihe inyeghachi gi: n'ihi na agēnyeghachi gi na nbilite-n'ọnwu nke ndi ezi omume.

15. Ma mb͕e otù onye nime ndi soro Ya nọdu na nri nuru ihe ndia, ọ si Ya, Ngọzi nādiri onye gēri nri n'ala-eze Chineke.

16. Ma Ọ siri ya, Otù nwoke siri nri-anyasi uku; we kpọ ọtutu madu:

17. o we zipu orù-ya n'oge hour nke nri-anyasi ahu isi ndi akpọwori, Bianu; n'ihi na edoziwo ihe nile ab͕u a.

18. Ma ha nile were otù olu malite iriọ ka arapu ha. Onye mbu siri ya, Azutaram ubi, ọ dikwam nkpà ipu gāle ya: ariọm gi guam n'onye riọrọ ka arapu ya.

19. Onye ọzọ si-kwa-ra, Azutaram ehi ọlu iri ejikọrọ abua abua, anamaga kwa inwa ha: ariọm gi guam n'onye riorọ ka arapu ya.

20. Onye ọzọ sikwara, Alurum nwunye, n'ihi nka apughi m ibia.

21. Orù ahu we bia, kọrọ onye-nwe-ya ihe ndia. Mb͕e ahu nna-nwe-ulo ahu, ebe iwe were ya, ọ si orù-ya, Pua ọsọsọ ga n'amá nile na uzọ ntà nile nke obodo, kpọbata n'ebe a ndi-ob͕eye na ndi-ọlusi na ndi-ìsì na ndi-ngwurọ.

22. Orù ahu we si, Onye-nwe-ayi, emewo ihe i nyere n'iwu, ọnọdu fọdu-kwa-ra.

23. Onye-nwe-ulo ahu we si orù-ya Pua ga n'uzọ nile na ogige nile, rugide kwa madu ka ha bata, ka ulom we juputa.

24. N'ihi na asim unu, na ọ dighi otù onye nime ndikom ahu ndi akpọworo gēdetu nri-anyasim ire.

25. Ma oké ìgwè madu nēso ya je: O we chigharia, si ha,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 14