9. ọ buru kwa na ọ mia nkpuru site n'ub͕u a, ọ di nma; ma ọ buru na ọ mighi, i gēb͕utu ya.
10. O we nēzí ihe n'otù nime ulo-nzukọ-ha n'ubọchi-izu-ike.
11. Ma le, otù nwanyi nke nwere mọ nke nēme ka aru-ya ghara idi ike arọ iri na asatọ; o rudakwara ala, ọ pughi kwa iweli onwe-ya elu ma-ọli.
12. Ma mb͕e Jisus huru nwanyi ahu, Ọ kpọ ya, si ya, Nwanyi, emewo gi ka i pua na nriaria-gi.
13. O we tukwasi nwanyi ahu aka-Ya abua: ngwa ngwa ewe me ka o guzozie ọtọ, o we nye Chineke otuto.