Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 13:32-35 Bible Nso (IGBOB)

32. O we si ha, Ganu, si nkita-ọhia ahu, Le, anamachupu ndi-mọ ọjọ, nāluzu kwa ọlu ime ka aru di madu ike ta na echi, n'ubọchi nke-atọ emekwam ka M'zu okè.

33. Otú ọ di, aghaghi m iga ta na echi na ubọchi so ya: n'ihi na apughi ikwe ka onye-amuma la n'iyì n'ebe nābughi Jerusalem.

34. Jerusalem, Jerusalem, nke nēb͕u ndi-amuma, nke nēwere kwa nkume atu ndi eziteworo ya! ọ̀tutu mb͕e ole ka M'chọrọ ichikọ umu-gi, ọbuná dika nnekwu-ọkuku nāchikọ umu nke aka ya n'okpuru nkù-ya abua, ma unu achọghi!

35. Le, anārapuru unu ulo-unu: ma asim unu, Unu agaghi-ahum ma-ọli, rue mb͕e unu gāsi, Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 13