1. Ma ufọdu nọ n'ebe ahu n'oge ahu ndi kọrọ Ya akukọ bayere ndi Galili ahu, ndi Pailat were ọbara-ha gwakọta n'àjà-ha.
2. O we za, si ha, Ùnu nēchè na ndi Galili ndia bu ndi-nmehie kari ndi Galili nile, n'ihi na ha ahuwo ahuhu ndia?
3. Asim unu, É-è: kama, ọ buru na unu echègharighi, unu nile gāla n'iyì otú ahu.
4. Ma-ọbu madu iri na asatọ ahu, ndi ulo-elu di na Sailoam dakwasiri ha, we b͕ue ha, ùnu nēchè na ndi ahu bu ndi ji ugwọ kari madu nile ndi bi na Jerusalem?
5. Asim unu, É-è; kama, ọ buru na unu echègharighi, unu nile gāla n'iyì otú a.