Ngọzi nādiri ndi-orù ahu, ndi, mb͕e onye-nwe-ha gābia, ọ gāhu ka ha nēche nche: n'ezie asim unu, na ọ gēke onwe-ya ihe-ọkiké n'úkwù, me ka ha nọdu na nri, ọ gābia kwa jere ha ozi.