Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 12:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. N'oge ahu, mb͕e oké ọtutu ìgwè madu anādighi-aguta aguta zukọrọ, nke mere ka ha nāzọkwasi ibe-ha ukwu, O buru uzọ malite isi ndi nēso uzọ-Ya, Nēzenu ihe ndi-Farisi, bú ihe nēko achicha, nke bu iru-abua.

2. Ma ọ dighi ihe ọ bula ekpuchiworo ekpuchi, nke anāgaghi-ekpughe: ọ dighi kwa ihe ezoro ezo, nke anāgaghi-ama.

3. Ya mere ihe ọ bula unu kwuru n'ọchichiri, agānu ya n'ìhè; ihe unu kwu kwa-ra na nti n'ime-ulo ntà, agēkwusa ya n'elu ulo.

4. Ma asim unu ndi-eyim, Unu atula egwu ndi nēb͕u aru, ma emesia ha enweghi ihe ọzọ kari nke ahu ha gēme.

5. Ma M'gēgosi unu Onye unu gātu egwu: tuanu egwu Onye ahu, Nke nwere ike itubà n'ọku ala-mọ mb͕e O b͕usiri; e, asim unu, Tuanu egwu Onye ahu.

6. Àdighi-ere egwele ise na penny abua? ma adighi-echezọ otù nime ha n'iru Chineke.

7. Ma ọbuná agiri-isi nile nke isi-unu ka aguworo. Unu atula egwu: ọnu-ahia-unu kariri nke ọtutu egwele.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 12