Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 11:22-32 Bible Nso (IGBOB)

22. ma mb͕e ọ bula onye ka ya ike gābia imegide ya, meri kwa ya, ọ nara ya ihe-agha-ya dum nke ọ tukwasiriri obi-ya, keri kwa ihe ọ nara ya.

23. Onye nādighi n'akukum nēmegidem; onye nādighi-esokwam ikpokọta ihe nāchusa achusa.

24. Mb͕e ọ bula mọ nādighi ọcha siri n'aru madu pua, ọ nāgabiga n'ebe miri nādighi nāchọ izu-ike: ma ebe ọ dighi-achọta ya, ọ si, M'gālaghachi n'ulom ebe m'siri puta.

25. Mb͕e ọ biara, o we hu ya ka azachasiri ya dozisia ya.

26. Mb͕e ahu ọ ga, chiri mọ-ibe-ya asa nke jọkari ya onwe-ya njọ tiyere onwe-ya; ha we ba biri n'ebe ahu: ọnọdu ikpe-azu nke madu ahu bia jọkari nke-mbu.

27. O we rue, mb͕e Ọ nēkwu okwu ndia, na otù nwanyi si n'etiti ìgwè madu ahu weli olu-ya, si Ya, Ngọzi nādiri afọ nke buru Gi, na ara nke I miri.

28. Ma Ya onwe-ya siri, Nke bu ezi-okwu kari bu, ngọzi nādiri ndi nuru okwu Chineke, debe kwa ya.

29. Ma mb͕e ìgwè madu nēzukọ n'ebe Ọ nọ, Ọ malitere isi, Ọb͕ọ a bu ajọ ọb͕ọ: ọ nāchọ ihe-iriba-ama; agaghi-enye kwa ya ihe-iriba-ama ma-ọbughi ihe-iriba-ama nke Jona.

30. N'ihi na dika Jona ghọrọ ndi Nineve ihe-iriba-ama, otú a ka Nwa nke madu gādi-kwa-ra ọb͕ọ a.

31. Agēme ka eze-nwanyi nke Ndida so ndikom nke ọb͕ọ a bilie n'ikpé ahu, ọ gāma kwa ha ikpé: n'ihi na o siri n'ebe uwa sọturu bia inu amam-ihe Solomom; ma le, Onye ka Solomom nọ n'ebe a.

32. Ndikom Nineve gēso ọb͕ọ a bilie n'ikpé ahu, ha gāma kwa ya ikpé: n'ihi na ha chèghariri na nkwusa nke Jona; ma le, Onye ka Jona nọ n'ebe a.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 11