Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 10:9-20 Bible Nso (IGBOB)

9. mekwanu ndi aru-ha nādighi ike nọ n'ebe ahu ka aru-ha di ike, si-kwa-nu ha, Ala-eze Chineke di unu nso.

10. Ma nime obodo ọ bula unu gābà, ma ha anaraghi unu nke-ọma, puanu n'amá-ya, si,

11. Ọbuná ájá si n'obodo-unu, nke rakuru n'ukwu-ayi, ka ayi nēhichapu imegide unu: otú ọ di, maranu nka, na ala-eze Chineke di nso.

12. Asim unu, Ala Sọdọm gānagide okwu n'ubọchi ahu kari obodo ahu.

13. Ahuhu gādiri gi, Korazin; ahuhu gādiri gi, Betsaida; n'ihi na asi na alururi ọlu nile di ike na Taia na Saidon, nke aluru nime unu, ha gēchèghariwori n'oge di anya gara aga, nānọdu n'ákwà-nkpe na ntu.

14. Otú ọ di, Taia na Saidon gānagide okwu n'ikpé ahu kari unu.

15. Gi onwe-gi kwa, Kapanaum, àgēweli gi rue elu-igwe? agēweda gi rue Hedis.

16. Onye nānu okwu-unu nānu okwu Mu onwem; onye nāju kwa unu nāju Mu onwem; ma onye nāju Mu onwem nāju Onye ziterem.

17. Ọgu ndikom atọ na iri ahu were ọṅù lata, si, Onye-nwe-ayi, ọbuná ndi-mọ ọjọ ka anēdo n'okpuru ayi n'aha-Gi.

18. O we si ha, Ahurum Setan ka ọ darari dika àmùmà pua n'elu-igwe.

19. Le, enyewom unu ike izọkwasi agwọ na akpi ukwu, na imegide ike onye-iro-unu nile: ọ dighi kwa ihe ọ bula gēmeru unu aru ma-ọli.

20. Otú ọ di, unu aṅurila ọṅu na nka, na anēdo ndi ajọ mọ n'okpuru unu; ma ṅurianu ọṅu na edewo aha-unu n'akwukwọ n'elu-igwe.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 10