Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 10:27-42 Bible Nso (IGBOB)

27. O we za, si, Hu Onye-nwe-ayi Chineke-gi n'anya site n'obi-gi dum, were kwa nkpuru-obi-gi dum, na ike-gi dum, na uche-gi dum; hu kwa onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi.

28. O we si ya, I zara nke-ọma: me nka, i gādi kwa ndu.

29. Ma ebe ọ nāchọ igu onwe-ya n'onye ezi omume, ọ si Jisus, Ònye bu kwa onye-ab͕ata-obim?

30. Jisus zara ya, si, Otù nwoke si na Jerusalem nārida iga Jeriko; o we dabà n'etiti ndi nāpunara madu ihe, ndi b͕ara ya ọtọ ti kwa ya ihe-otiti, we la, rapu ya ọtọgbọrọ.

31. Ma n'otù mb͕e ahu otù onye-nchu-àjà nārida n'uzọ ahu: mb͕e ọ huru ya, o we si n'akuku uzọ ọzọ gabiga.

32. Otú ahu onye Livai, mbe ọ biaruru ebe ahu, hu kwa ya, o we si kwa n'akuku uzọ ọzọ gabiga.

33. Ma otù onye Sameria, mb͕e ọ nọ n'ije, ọ bia rue n'ebe ọ nọ: mb͕e ọ huru ya, o we nwe ọmiko n'aru ya,

34. o we biakute ya, ke ọnyá nile ya, wukwasi ha manu na manya-vine; o we tukwasi ya n'anu-ulo nke aka ya, dubata ya n'ulo ndi-ọbìa, we le ya anya nke-ọma.

35. N'echi-ya o we tuputa shilling abua, nye onye-nwe ulo ndi-ọbìa ahu, si, Le ya anya nke-ọma; ihe ọ bula i n'akuku uzọ kari, mu onwem, mb͕e m'latara, m'gākwughachi gi.

36. Ọ̀ bu onye nime madu atọ a, ka i chère, gosiri onwe-ya ka onye-ab͕ata-obi nke onye ahu dabàra n'etiti ndi ahu nāpunara madu ihe?

37. Ọ si, Onye ahu nke mere ya ebere. Jisus we si ya, Ga, gi onwe-gi me kwa otú ahu.

38. Ma mb͕e ha nāga, Ya onwe-ya batara n'otù obodo ntà: otù nwanyi, aha-ya bu Mata, we kpọbata Ya n'ulo-ya.

39. O nwekwara nwa-nne-nwanyi anākpọ Meri, onye nānọdu kwa ala n'ukwu ala Onye-nwe-ayi, we nu okwu-Ya.

40. Ma uche Mata nābasasi n'ije-ozi nke-uku; o we biakute Ya ọsọsọ, si, Onye-nwe-ayi, ò metughi Gi n'obi na nwa-nnem nwanyi nārapum ka nání mu nēje ozi? ya mere, gwa ya ka o yerem aka.

41. Ma Onye-nwe-ayi zara, si ya, Mata, Mata, i nēcheb͕u onwe-gi nēsob͕u kwa onwe-gi n'ihi ọtutu ihe:

42. ma otu ihe bu ihe di nkpà: n'ihi na Meri rọputara ezi òkè ahu, nke anāgaghi-anapu ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 10