55. (Dika Ọ gwara nna-ayi-hà)N'ebe Abraham na nkpuru-ya nọ rue mb͕e ebighi-ebi.
56. Meri we nọyere ya ihe dika ọnwa atọ, we laghachi n'ulo-ya.
57. Ma oge Elizabet zuru ka ọ gāmuta nwa; o we mua nwa-nwoke.
58. Ndi-ab͕ata-obi-ya na ndi-ikwu-ya we nu na Onye-nwe-ayi mere ka ebere-Ya di uku n'ebe ọ nọ; ha we so ya ṅuri ọṅu.
59. O we rue n'ubọchi nke-asato, na ha biara ibi nwatakiri ahu úgwù; ha we kpọbá ya Zakaraias, n'aha nna-ya.
60. Nne-ya we za, si, mba; kama agākpọ ya Jọn.
61. Ha we si ya, Ọ dighi onye ọ bula n'etiti ndi-ikwu-gi nke anākpọ aha nka.
62. Ha we fere nna-ya aka, ihe ọ chọrọ ka akpọ ya.
63. O we riọ ha ka ha nye ya ihe eji ede akwukwọ, o we de, si, Aha-ya bu Jọn. O we ju ha nile anya.