47. Ya mere ndi-Farisi zara ha, si, Èduhiewo kwa unu onwe-unu?
48. Ọ̀ di onye ọ bula n'etiti ndi-isi, ma-ọbu n'etiti ndi-Farisi, kwere na Ya?
49. Ma ìgwè madu a nke nāmaghi iwu-ayi bu ndi anābu ọnu.
50. Nikọdimọs si ha (onye biakutere Ya na mbu, ebe ọ bu otù onye nime ha),
51. Ìwu-ayi nēkpe madu ikpé, ọ buru na o bughi uzọ nu n'ọnu-ya, we mara ihe ọ nēme?
52. Ha zara, si ya, Gì onwe-gi si kwa na Galili puta? Nyocha n'akwukwọ nsọ, le kwa na ọ dighi onye-amuma si na Galili bilie.