Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jọn 7:44-53 Bible Nso (IGBOB)

44. Ma ufọdu nime ha chọrọ ijide Ya; ma ọ dighi onye ọ bula tukwasiri Ya aka.

45. Ya mere ndi ahu ndi nēje ozi biakutere ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi; ndi ahu we si ha, N'ìhi gini ka unu nēkutaghi Ya?

46. Ndi ahu ndi nēje ozi zara, si, Ọ dighi mb͕e ọ bula madu kwuru okwu di otú a.

47. Ya mere ndi-Farisi zara ha, si, Èduhiewo kwa unu onwe-unu?

48. Ọ̀ di onye ọ bula n'etiti ndi-isi, ma-ọbu n'etiti ndi-Farisi, kwere na Ya?

49. Ma ìgwè madu a nke nāmaghi iwu-ayi bu ndi anābu ọnu.

50. Nikọdimọs si ha (onye biakutere Ya na mbu, ebe ọ bu otù onye nime ha),

51. Ìwu-ayi nēkpe madu ikpé, ọ buru na o bughi uzọ nu n'ọnu-ya, we mara ihe ọ nēme?

52. Ha zara, si ya, Gì onwe-gi si kwa na Galili puta? Nyocha n'akwukwọ nsọ, le kwa na ọ dighi onye-amuma si na Galili bilie.

53. Ha nile we la, onye ọ bula n'ulo nke aka ya:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jọn 7