Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jọn 6:44-58 Bible Nso (IGBOB)

44. Ọ dighi onye ọ bula puru ibiakutem, ọ buru na Nna Nke ziterem adọghi ya: Mu onwem gēme kwa ka o si n'ọnwu bilie n'ubọchi ikpe-azu.

45. Edewo ya n'akwukwọ ndi-amuma, si, Ha nile gābu kwa ndi Chineke zíworo ihe. Onye ọ bula nke nuworo site n'ọnu Nnam, nke mutawo-kwa-ra ihe, ọ nābiakutem.

46. Ọ bughi na madu ọ bula ahuwo Nnam, ma-ọbughi Onye ahu Nke si n'ebe Chineke nọ puta, Onye ahu ahuwo Nnam.

47. N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye nēkwere nēnwe ndu ebighi-ebi.

48. Mu onwem bu nri nke nēnye ndu.

49. Nna-unu-hà riri manna ahu n'ọhia, ha we nwua.

50. Nka bu nri nke si n'elu-igwe ridata, ka madu we rie ufọdu nime ya, ghara kwa inwu anwu.

51. Mu onwem bu nri di ndu nke siri n'elu-igwe ridata: ọ buru na madu erie ufọdu nime nri a, ọ gādi ndu rue mb͕e ebighi-ebi: ma nri nke Mu onwem gēnye kwa bu anu-arum, n'ihi ndu nke uwa.

52. Ya mere ndi-Ju nālurita uka n'etiti onwe-ha, si, Onye a, Ò si aṅa pu inye ayi anu-aru-Ya ka ayi rie?

53. Ya mere Jisus siri ha, N'ezie, n'ezie, asim unu, Ọ buru na unu erighi anu-aru nke Nwa nke madu, ọ buru kwa na unu aṅughi ọbara-Ya, unu enweghi ndu nime onwe-unu.

54. Onye nēri anu-arum, nke nāṅu kwa ọbaram, o nwere ndu ebighi-ebi; Mu onwem gēme kwa ka o si n'ọnwu bilie n'ubọchi ikpe-azu.

55. N'ihi na anu-arum bu ihe-oriri n'ezie, ọbaram bu kwa ihe-ọṅuṅu n'ezie.

56. Onye nēri anu-arum, nke nāṅu kwa ọbaram, ọ nānọgide nimem, Mu onwem kwa nime ya.

57. Dika Nna Nke di ndu ziterem, dika Mu onwem di kwa ndu n'ihi Nnam; otú a onye nērim, onye ahu gādi kwa ndu n'ihim.

58. Nka bu nri ahu nke siri n'elu-igwe ridata: ọ bughi dika nna-unu-hà riri, we nwua: onye nēri nri a gādi ndu rue mb͕e ebighi-ebi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jọn 6