Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jọn 5:42-47 Bible Nso (IGBOB)

42. Ma amaram unu, na unu enweghi ihu-n'anya Chineke nime onwe-unu.

43. Mu onwem abiawo n'aha Nnam, ma unu anaraghm: ọ buru na onye ọzọ gābia n'aha nke aka ya, onye ahu ka unu gānara.

44. Ùnu onwe-unu si aṅa pu ikwe, ebe unu nānara otuto n'aka ibe-unu, ma otuto nke si n'aka Onye ahu Nke nání Ya bu Chineke bia unu achọghi?

45. Unu echèla na Mu onwem gēbo unu ebubo n'iru Nnam: otù onye di nēbo unu ebubo, bú Moses, onye unu onwe-unu tukwasiworo obi-unu na ya.

46. N'ihi na ọ buru na unu kwere Moses, unu gēkwem; n'ihi na ya onwe-ya dere ihe bayerem n'akwukwọ.

47. Ma ọ buru na unu ekweghi ihe onye ahu dere n'akwukwọ, ùnu gēsi aṅa kwere okwu nkem?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jọn 5